Ụtọasụsụ Igbo
Igbo ndị ọma ekelee m unu.
Onye nwe mmadụ nọnyere ụnụ. Ọ bụ site na mmasị pụrụ iche ka m jiri were Igbo na-ekele onye ọ bụla. Aha m bụ Mazị Emeka Agbaka. Ihe gbasara Igbo na-ahụ m ọkụ n'obi dị ka o si ahụkwa ụfọdụ ndị Igbo dịkwa iche iche. Eleghị anya ọ ga-abụrụ gị ihe ọchị na-ịgụ asụsụ gị siiri gị ike nke ukwu, esogbula n'ihi na ihe mmadụ amaghị karịrị ya ma cheta na onye mụrụnụ ga-amụta. Ihe ndị Igbo jiri karichaa bụ na o nweghị ihe ha kpọrọ mkpa ha agaghị emeli dịka ịmụ asụsụ dị iche iche. Anyị na-aga mba ụwa dị iche iche biri soro ha na-asụ ma na-edekwa asụsụ ha nke ọma. Asụsụ Igbo esika, ajụjụ m wee bụrụ ma ị gbaala mbọ ịmụta ya ma o kweghị gị mmụta? Bekee dị anyị mfe n'ọnụ maka na anyị tinyere uchu na ya nke ukwu. Ndị òtù UNESCO na-eti mkpu na asụsụ Igbo ga-ada mmiri tupu afọ iri ise na-abịa abịa, ma ọ na-efe anyị efe na ntị. Asụsụ bekee na-achọ ịgbagburu anyị asụsụ Igbo n'ime oke osimiri. Ndị ọma, ọ naghị adị mma ọ dọbie ezokọọ n’ihi na ọ naghị ezuzi òkè.
Anyị bụ ndị Igbo ñụtara asụsụ bekee were ya na-ata atụ, na-awụ ahụ, na-arahụ ụra, na-eri ya ka nri ma na añụkwa ya ka mmiri. Ndị Igbo ka anyị ghara ichezọ na onye nñụñụ ọgọdọ anaghị agbasi egwu ike n'ọgbọ. Oge eruole mgbe anyị ga-akwụsị iji onye kara mara asụ maọbụ ede bekee eme tụụtụụgaagaa, maka na garagara dị mma, ma gadanga bụ agwụ. O ruole oge ndị Igbo ga na-ámà áká onye ga-asụkarị ibe ya Igbo na-etinyeghị ótù mkpụrụ bekee na ya. Asụsụ bụ ihe e ji ama agbụrụ ma ọ bụ mba. Igbo bụ asụsụ anyị, bụrụ agbụrụ na ala anyị. O nweghị nke ga-agawa hapụ ibe ya.
Arịrịọ m wee bụrụ ka anyị bụ ndị Igbo ghara ịkpọ ọba anyị mkpọkọrọ ọba maka na onye kpọọ ite ya mkpọkọrọ ite ndị iro ewere ya kpoo ntụ ụtụtụ. Ndị Shaịna kwuru na onye chọrọ ịchị mmadụ ma ọ bụ obodo ọchịchị ụwatụwa ya mụgosị ya/ha asụsụ nke ya. Bekee bụ asụsụ anyị mụtara n'aka ndị ọbịarachịwa ma ọ na-achọ ịnapụ anyị asụsụ nke anyị na-agbanyeghị na ndị Igbo kwuru na nke anyị (Bekee) bụ nke anyị ma nke m (Igbo) bụ nke m. Biko ndị Igbo ibe m, anyị agaghị ekworonụ maka na agụ na-emeri enwe sị na ụdara nwa enwe ga-abụzi ụdara nwa agụ. Mba niile ndị bekee chịrị mgbe ochie sokwa asụ asụsụ bekee dị ka anyị. Ma 'na' dị na ya bụ na ha na-ewere bekee dị ka asụsụ abụọ ha gbadosie ụkwụ ike n'asụsụ ha.
Ka anyị na-àzọ́ onwe anyị, ka anyị ga na-azọkwa asụsụ anyị bụ Igbo n’ihi na ọ bụ dike na-azọ ala, ala a na-azo dike. Anyị agaghị anọ bekee agbagbuoro anyị ya n’ime osimiri maka na okenye anaghị anọ n’ụlọ ewu amụọ n’ọgbịrị. Ka anyị chetanụ na ọ na-abụ ejula kpụrụ ọ kpụrụ ikikere ya. Ka anyị tinye anya na ihe gbasara ụtọasụsụ Igbo kpọọ ya mkpa maka na o si taata dị mma na ọ dịbara gboo.
Ụtọasụsụ Igbo dị mkpa ụmụaka anyị ịmụta, were bekee kpọọrọ ya aka maka na ọ̀kwà gwara ụmụ ya, ha tụrụ ji ha tụrụ mkpọrọgwụ maka ụbọchị onye nwe ji ga-egwuru ji ya ka ha tụrụwa mkpọrọgwụ. Sụwakwa Igbo!
Isi okwu m wee bụrụ na Igbo ga-adị.
Presented by Mazị Emeka Agbaka
www.igbogaadi.org